DIBIA NA ALA IGBO ||| IGBO NATIVE DOCTORS

in #culture6 years ago

(please checkout for English version of this post below)

INWERE EZI NGHỌTA BANYERE DIBIA IGBO?

image
eserese ndi nolywood

Gini bụ dibia?

Dibia, a bụghị íhé, dibia bụ ónyé, dibia bụ ọka-mmụta na ọgwụgwọ ọrịa.

Onye bụ dibia igbo?

A bị na ala igbo, enwere ụzo dibia abuọ ama-ama, nke izizi bụ dibia mgbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ, nke abụọ bụ dibia mmụọ.

Gịnị dị iche na etiti dibia mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ nakwazi dibia mmụọ?

Anyị ga-amalite na dibia mgbọrọgwụ na mmkpakwụkwọ; nke a bụ dibia ama-ama iji ụmụ ahịhịa nakwazi ụmụ mgbọrọgwụ dị iche iche we na-gwọ ndi mmadụ oria di iche iche.

Ọrụ a nke ndi dibia mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ na-alu, ọ bụ ihe ha na agụta na akwụkwọ nakwa na mmụta?

Éé è, adịghị amụta ya n'ụlọ akwụkwọ, nkea bụ ihe ndi igbo ji wee bụrụ ọpụrụ iche, tupu ndi ọcha abịa wee wakpo ndi isi oji n'ike, enwewoorị ndi dibia mgbọrọgwụ nakwazị mkpakwụkwọ, nke a pụtara na mmụtá nke ndị bekee abụghị ya bụ ọka ibe, kama ndị bekee ghọrịrị ndi isi oji, ha wee tufue onyinye anara nke chukwuokike abiama nyere ha site na mbụ.

image
eserese google

Dibia mgbọrọgụ na nkpakwụkwọ bụ osinachi, ọ na esi na-aka nna wee baa na-aka nwa, n'oge gboo na ala igbo, ndi dibia a na anụ ihe nkpọrọgwụ nakwazi mkpakwụkwọ na ekwe, nkea mere na ndi nna anyị ochie ji wee bie ezigbo ndu tọrọ-atò, n'ihi na ha adịghị a nọ na-akwa ọrịa dịka anyị si anọ na ya ugbua.

Gịnị mere o ji wee dizie ka enwere nkewa na etiti ndi ụka nakwazi ndi omenala na ala igbo taa?

Okwesighị ịdị etua ma ọlị, ghọtahie nile ndi ahụ sutere na nghọri nke bekee ghọrịrị ndi isi oji wee gwa ha na onye ọ bụla na etinye isi na be dibia bụ onye nnjọ, nkea abụghị eziokwu ma ọlị, asị m kwue, m ga asị na ọ bụ uzọ ndi igbo ji agwọ ọria bụ nke ka mma, n'ihi na ọ bụ etua ka chukwuokike si debe ọgwụgwọ nye mmadụ site na okike ụwa.

image
eserese google

Na mpịakọta

Anyị ga-aga n'iru ikparịta uka n'ebe o metutara dibia na ala igbo, ma ọ ga abụzi oge ọzọ, any agaghị akụ mmanụ iracha aka n'ihi na anyi agaghi afaba ya na uko!

**Dalụ maka ikwado asụsụ igbo na steemit.

Ka emesia.


(English translation)


How well did you know about Igbo native doctors?

who are these Igbo native doctors?

Igbo native doctors are grouped in two major groups known as herbal doctors and spiritual/native doctors.

Today, we’ll cover much on the herbal doctors in Igbo land.

Igbo people are known for their strong faith in natural and natural forces, thus, they are highly spiritual and highly natural. The physical doctors are the herbalist as you know, they believe in bringing together natural seeds, fruits, leaves 🍁 and roots for human medication.

While the spiritual types believe in incantations, invoking spiritual powers to heal the sick miraculously.

Both has proved themselves to be true over ages in Igbo land.

In Igbo land, the herbal doctors are believed that they speak to herbs and in return receive the reciprocates from the herbs which made our forefathers to live a better and fulfilled life more than us today.

These men believe in 100% herbal treatment, and it works perfectly for the tribe which they prefer to scientific medicines. They gave their reasons which includes that such practices is a gift to them from creation which is passed from generation to generation.

They also prefer herbal medication due to they are free of side effects,

Enmity between some religious beliefs and traditions in Igbo land

Before the invasion of Europe to Africa, blacks especially the Igbo people believed in spirits and gods, and they also believed in ‘God almighty creator’ (chiukwu okike)

And they were living peaceful in their belief until the introduction of various religions, these religions and western education made them to believe that their way of life and their medications are ill and obsolete, these new religions made them believe that going to receive healing from spiritual doctors as well as receiving from herbal doctors are sin against God and their doctrines.

These controversies brought the decline of Igbo native doctors for many years until recently when most of the Igbo people has developed a free thinking mind to understand that their way of life remains the best for them.

Thanks for reading

Thanks to steemit for this great opportunity to project Igbo culture and language to the world and let them understand us better, understanding of one another is the key to our peaceful coexistence.

Sort:  

Lovely, good job 👍🏽 steemit is a place to be, promoting our culture in this way can really help us to know who we are.

I encourage you to continue on this.

Ekele dịrị gi.

Thanks to you.

Congratulations @ichie1! You have completed some achievement on Steemit and have been rewarded with new badge(s) :

Award for the number of upvotes

Click on any badge to view your own Board of Honor on SteemitBoard.
For more information about SteemitBoard, click here

If you no longer want to receive notifications, reply to this comment with the word STOP

By upvoting this notification, you can help all Steemit users. Learn how here!

I mela. You’ve done well

Coin Marketplace

STEEM 0.28
TRX 0.12
JST 0.034
BTC 63582.29
ETH 3267.43
USDT 1.00
SBD 3.93